Native Bible

Psalms 22:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A wụpụla m dịka mmiri, ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha. Obi m agbazela dịka mmanụ, obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m.

Psalms 22:14 in English

Psalms 22:14 · Berean Standard Bible

I am poured out like water, and all my bones are disjointed. My heart is like wax; it melts away within me.

Context

12Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu; oke ehi dị ike nke Bashan* gbara m gburugburu. 13Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa asaghepụla ọnụ ha megide m. 14A wụpụla m dịka mmiri, ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha. Obi m agbazela dịka mmanụ, obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m. 15Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime. Ire m na-araparakwa m nʼọnụ, nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ. 16Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu; otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu, ha adupuola m aka m na ụkwụ m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.