Abụ Ọma 22:14
Psalms 22:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A wụpụla m dịka mmiri, ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha. Obi m agbazela dịka mmanụ, obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m.
Psalms 22:14 in English
Psalms 22:14 · Berean Standard Bible
I am poured out like water, and all my bones are disjointed. My heart is like wax; it melts away within me.
Context
12Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu;
oke ehi dị ike nke Bashan* gbara m gburugburu. 13Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa
asaghepụla ọnụ ha megide m. 14A wụpụla m dịka mmiri,
ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha.
Obi m agbazela dịka mmanụ,
obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m. 15Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime.
Ire m na-araparakwa m nʼọnụ,
nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ. 16Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu;
otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu,
ha adupuola m aka m na ụkwụ m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.