Abụ Ọma 22:16
Psalms 22:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu; otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu, ha adupuola m aka m na ụkwụ m.
Psalms 22:16 in English
Psalms 22:16 · Berean Standard Bible
For dogs surround me; a band of evil men encircles me; they have pierced my hands and feet.*
Context
14A wụpụla m dịka mmiri,
ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha.
Obi m agbazela dịka mmanụ,
obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m. 15Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime.
Ire m na-araparakwa m nʼọnụ,
nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ. 16Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu;
otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu,
ha adupuola m aka m na ụkwụ m. 17A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ;
ndị mmadụ na-ele m anya na-emikwa ọnụ ọchị 18Ha na-eke uwe m nʼetiti ha,
ha sitere nʼife nza kee uwe m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.