Abụ Ọma 22:9
Psalms 22:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Onyenwe anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara.
Psalms 22:9 in English
Psalms 22:9 · Berean Standard Bible
Yet You brought me forth from the womb; You made me secure at my mother’s breast.
Context
7Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị;
na-emiri m ọnụ ịkwa emo, na-efufekwa isi ha na-asị. 8“O na-atụkwasị Onyenwe anyị obi;
ka Onyenwe anyị bịa gbapụta ya.
Ya napụta ya ebe ọ bụ
na ihe ya masịrị ya.” 9Ma Onyenwe anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m.
Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara. 10Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị.
Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m. 11Anọla m ebe dị anya,
nʼihi na nsogbu dị nso.
Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.