Native Bible

Psalms 22:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“O na-atụkwasị Onyenwe anyị obi; ka Onyenwe anyị bịa gbapụta ya. Ya napụta ya ebe ọ bụ na ihe ya masịrị ya.”

Psalms 22:8 in English

Psalms 22:8 · Berean Standard Bible

“He trusts in the LORD, let the LORD deliver him; let the LORD rescue him, since He delights in him.”*

Context

6Abụ m idide, abụghị m mmadụ; onye ndị ọzọ na-akwa emo, onye ndị mmadụ na-eleda anya. 7Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị; na-emiri m ọnụ ịkwa emo, na-efufekwa isi ha na-asị. 8“O na-atụkwasị Onyenwe anyị obi; ka Onyenwe anyị bịa gbapụta ya. Ya napụta ya ebe ọ bụ na ihe ya masịrị ya.” 9Ma Onyenwe anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara. 10Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị. Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.