Abụ Ọma 18:7
Psalms 18:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji, ntọala niile nke ugwu niile makwara jijiji, ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya.
Psalms 18:7 in English
Psalms 18:7 · Berean Standard Bible
Then the earth shook and quaked, and the foundations of the mountains trembled; they were shaken because He burned with anger.
Context
5Ụdọ nke ili kere m gburugburu,
ọnya nke ọnwụ guzogidere m. 6Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị;
etiri m mkpu akwa, kpọkuo Chineke m ka o nyere m aka;
akwa m rutekwara ya ntị,
o sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m. 7Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji,
ntọala niile nke ugwu niile makwara jijiji,
ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya. 8Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta,
ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta;
icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta. 9O kewara mbara eluigwe, rịdata;
oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.