Native Bible

Psalms 18:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta, ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta; icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta.

Psalms 18:8 in English

Psalms 18:8 · Berean Standard Bible

Smoke rose from His nostrils, and consuming fire came from His mouth; glowing coals blazed forth.

Context

6Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị; etiri m mkpu akwa, kpọkuo Chineke m ka o nyere m aka; akwa m rutekwara ya ntị, o sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m. 7Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji, ntọala niile nke ugwu niile makwara jijiji, ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya. 8Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta, ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta; icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta. 9O kewara mbara eluigwe, rịdata; oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya. 10Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim* felie elu, o feliri elu nʼelu nku nke ifufe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.