Abụ Ọma 18:8
Psalms 18:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta, ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta; icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta.
Psalms 18:8 in English
Psalms 18:8 · Berean Standard Bible
Smoke rose from His nostrils, and consuming fire came from His mouth; glowing coals blazed forth.
Context
6Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị;
etiri m mkpu akwa, kpọkuo Chineke m ka o nyere m aka;
akwa m rutekwara ya ntị,
o sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m. 7Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji,
ntọala niile nke ugwu niile makwara jijiji,
ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya. 8Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta,
ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta;
icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta. 9O kewara mbara eluigwe, rịdata;
oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya. 10Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim* felie elu,
o feliri elu nʼelu nku nke ifufe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.