Native Bible

Psalms 18:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim* felie elu, o feliri elu nʼelu nku nke ifufe.

Psalms 18:10 in English

Psalms 18:10 · Berean Standard Bible

He mounted a cherub and flew; He soared on the wings of the wind.

Context

8Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta, ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta; icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta. 9O kewara mbara eluigwe, rịdata; oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya. 10Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim* felie elu, o feliri elu nʼelu nku nke ifufe. 11O mere ọchịchịrị ebe nzuzo ya, ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu, bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe. 12Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, igwe ojii ji mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe gabiga.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.