Abụ Ọma 18:9
Psalms 18:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O kewara mbara eluigwe, rịdata; oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya.
Psalms 18:9 in English
Psalms 18:9 · Berean Standard Bible
He parted the heavens and came down with dark clouds beneath His feet.
Context
7Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji,
ntọala niile nke ugwu niile makwara jijiji,
ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya. 8Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta,
ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta;
icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta. 9O kewara mbara eluigwe, rịdata;
oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya. 10Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim* felie elu,
o feliri elu nʼelu nku nke ifufe. 11O mere ọchịchịrị ebe nzuzo ya, ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,
bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.