Abụ Ọma 16:6
Psalms 16:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọtụtụ oke ala niile dabara m nʼebe dị ezi mma; nʼezie, e nwere m ihe nketa nke na-enye m ọṅụ.
Psalms 16:6 in English
Psalms 16:6 · Berean Standard Bible
The lines of my boundary have fallen in pleasant places; surely my inheritance is delightful.
Context
4Iru ụjụ nke ndị ahụ na-agbaso chi ndị ọzọ ga-aba ụba.
Agaghị m eso ha wụsa aja ihe ọṅụṅụ ọbara* nye chi ndị a,
maọbụ were egbugbere ọnụ m kpọọ aha ha. 5Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m;*
ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza. 6Ọtụtụ oke ala niile dabara m nʼebe dị ezi mma;
nʼezie, e nwere m ihe nketa nke na-enye m ọṅụ. 7Aga m eto Onyenwe anyị, onye na-adụ m ọdụ;
ọ bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme. 8Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile.
Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.