Native Bible

Psalms 16:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Iru ụjụ nke ndị ahụ na-agbaso chi ndị ọzọ ga-aba ụba. Agaghị m eso ha wụsa aja ihe ọṅụṅụ ọbara* nye chi ndị a, maọbụ were egbugbere ọnụ m kpọọ aha ha.

Psalms 16:4 in English

Psalms 16:4 · Berean Standard Bible

Sorrows will multiply to those who chase other gods. I will not pour out their libations of blood, or speak their names with my lips.

Context

2A gwara m Onyenwe anyị, “Ị bụ Onyenwe m, e wezuga gị, enwekwaghị m ọdịmma ọbụla.” 3Ana m asị maka ndị nsọ bụ ndị nọ nʼala a, “Ha bụ ndị a na-asọpụrụ, ndị ihe ha nʼatọ m ụtọ.” 4Iru ụjụ nke ndị ahụ na-agbaso chi ndị ọzọ ga-aba ụba. Agaghị m eso ha wụsa aja ihe ọṅụṅụ ọbara* nye chi ndị a, maọbụ were egbugbere ọnụ m kpọọ aha ha. 5Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m;* ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza. 6Ọtụtụ oke ala niile dabara m nʼebe dị ezi mma; nʼezie, e nwere m ihe nketa nke na-enye m ọṅụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.