Abụ Ọma 16:3
Psalms 16:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ana m asị maka ndị nsọ bụ ndị nọ nʼala a, “Ha bụ ndị a na-asọpụrụ, ndị ihe ha nʼatọ m ụtọ.”
Psalms 16:3 in English
Psalms 16:3 · Berean Standard Bible
As for the saints in the land, they are the excellence in whom all my delight resides.
Context
1Chebe m, O Chineke,
nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ. 2A gwara m Onyenwe anyị, “Ị bụ Onyenwe m,
e wezuga gị, enwekwaghị m ọdịmma ọbụla.” 3Ana m asị maka ndị nsọ bụ ndị nọ nʼala a,
“Ha bụ ndị a na-asọpụrụ, ndị ihe ha nʼatọ m ụtọ.” 4Iru ụjụ nke ndị ahụ na-agbaso chi ndị ọzọ ga-aba ụba.
Agaghị m eso ha wụsa aja ihe ọṅụṅụ ọbara* nye chi ndị a,
maọbụ were egbugbere ọnụ m kpọọ aha ha. 5Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m;*
ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.