Abụ Ọma 16:8
Psalms 16:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile. Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji.
Psalms 16:8 in English
Psalms 16:8 · Berean Standard Bible
I have set * the LORD always before me. Because He is at my right hand, I will not be shaken.
Context
6Ọtụtụ oke ala niile dabara m nʼebe dị ezi mma;
nʼezie, e nwere m ihe nketa nke na-enye m ọṅụ. 7Aga m eto Onyenwe anyị, onye na-adụ m ọdụ;
ọ bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme. 8Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile.
Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji. 9Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ;
aga m anọkwa nʼudo. 10Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ,
ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi* hụ ire ure.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.