Native Bible

Psalms 16:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ; aga m anọkwa nʼudo.

Psalms 16:9 in English

Psalms 16:9 · Berean Standard Bible

Therefore my heart is glad and my tongue rejoices; my body also will dwell securely.*

Context

7Aga m eto Onyenwe anyị, onye na-adụ m ọdụ; ọ bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme. 8Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile. Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji. 9Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ; aga m anọkwa nʼudo. 10Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ, ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi* hụ ire ure. 11I gosila m ụzọ ndụ; ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị; ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi. 16:4 Nʼọtụtụ mba, mmanya bụ ihe e ji agọ ọfọ, ma nʼomenaala mba ụfọdụ, ọbara onye ahụ eji achụ aja ka a na-ewere gwakọọ na mmanya, wụpụ nʼebe ịchụ aja, nke ka a maara dịka aja ọbara. Ọ bụ omenaala mba ndị ahụ na-amaghị Chineke ka onye dere abụ ọma a na-emegide. Lev 18:21; Lev 20:1-2; 2Ez 16:3; 2Ez 23:10. 16:5 Iko a na-ekwu ihe banyere ya nʼebe a bụ iko a na-enye ndị akpọrọ oriri nʼoge mmemme. Dan 5:1-4 16:10 Maọbụ, onye gị dị nsọ

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.