Abụ Ọma 16:10
Psalms 16:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ, ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi* hụ ire ure.
Psalms 16:10 in English
Psalms 16:10 · Berean Standard Bible
For You will not abandon my soul to Sheol, nor will You let Your Holy One see decay.*
Context
8Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile.
Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji. 9Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ;
aga m anọkwa nʼudo. 10Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ,
ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi* hụ ire ure. 11I gosila m ụzọ ndụ;
ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị;
ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.
16:4 Nʼọtụtụ mba, mmanya bụ ihe e ji agọ ọfọ, ma nʼomenaala mba ụfọdụ, ọbara onye ahụ eji achụ aja ka a na-ewere gwakọọ na mmanya, wụpụ nʼebe ịchụ aja, nke ka a maara dịka aja ọbara. Ọ bụ omenaala mba ndị ahụ na-amaghị Chineke ka onye dere abụ ọma a na-emegide. Lev 18:21; Lev 20:1-2; 2Ez 16:3; 2Ez 23:10.
16:5 Iko a na-ekwu ihe banyere ya nʼebe a bụ iko a na-enye ndị akpọrọ oriri nʼoge mmemme. Dan 5:1-4
16:10 Maọbụ, onye gị dị nsọ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.