Abụ Ọma 144
Psalms 144 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye bụ oke nkume m,
onye na-ezi aka m abụọ ibu agha,
na mkpịsịaka m ịlụ ọgụ. 2Ọ bụ Chineke m, onye jupụtara nʼịhụnanya, bụrụkwa ebe mgbaba m e wusiri ike,
ebe m e wusiri ike na onye mgbapụta m,
ọ bụ ọta m, onye m na-agbaba nʼime ya,
onye ji aka ike mee ka ndị dị iche iche nọdụ nʼokpuru m. 3O Onyenwe anyị, gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche echiche banyere ya,*
gịnị ka nwa nke mmadụ bụ ihe banyere ya ji na-emetụ gị nʼobi? 4Mmadụ dị ka otu nkuume;
ụbọchị ndụ ya niile na-agafe ngwangwa dịka onyinyo. 5O Onyenwe anyị, kewaa eluigwe rịdata;
metụ ugwu niile aka ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ. 6Zipụ amụma ka o chụsasịa ndị iro niile;
gbaa ha àkụ gị niile ma chụsasịa ha. 7Site nʼelu setịpụ aka gị;
gbapụta m, napụtakwa m
site nʼoke osimiri,
site nʼaka ndị si mba ọzọ, 8ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha,
ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ. 9O Chineke, aga m abụku gị abụ ọhụrụ.
Une e ji akwara iri mee ka m ga-eji kpọọrọ gị egwu; 10gị onye na-enye ndị eze mmeri,
onye na-agbapụta ohu ya Devid.
Site na mma agha dị njọ 11gbapụta m;
napụtakwa m site nʼaka ndị si mba ọzọ
ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha,
ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ. 12Mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom anyị, nʼoge okorobịa ha,
ga-adị ka ihe a kụrụ nʼala e lekọtara anya nke ọma,
ụmụ anyị ndị inyom ga-adị ka ogidi a pịrị apị
e ji achọ ụlọeze mma. 13Ọba anyị niile ga-ejupụta nʼihe oriri
dị iche iche si nʼubi anyị.
Atụrụ anyị ga-amụba nʼọtụtụ puku nʼọnụọgụgụ,
ha ga-adị iri puku kwụrụ puku nʼubi anyị; 14igwe ehi anyị ga-adọkpụ ibu dị arọ.
A gaghị enwe ntipu na mgbidi anyị niile,
a gaghị adọta anyị nʼagha gaa obodo ọzọ,
akwa ihe mgbu agaghị adị nʼokporoụzọ anyị niile. 15Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị ihe ndị a dịịrị;
ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha.
144:3 Abụ 8:4
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.