Abụ Ọma 144:14
Psalms 144:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
igwe ehi anyị ga-adọkpụ ibu dị arọ. A gaghị enwe ntipu na mgbidi anyị niile, a gaghị adọta anyị nʼagha gaa obodo ọzọ, akwa ihe mgbu agaghị adị nʼokporoụzọ anyị niile.
Psalms 144:14 in English
Psalms 144:14 · Berean Standard Bible
Our oxen will bear great loads.* There will be no breach in the walls, no going into captivity, and no cry of lament in our streets.
Context
12Mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom anyị, nʼoge okorobịa ha,
ga-adị ka ihe a kụrụ nʼala e lekọtara anya nke ọma,
ụmụ anyị ndị inyom ga-adị ka ogidi a pịrị apị
e ji achọ ụlọeze mma. 13Ọba anyị niile ga-ejupụta nʼihe oriri
dị iche iche si nʼubi anyị.
Atụrụ anyị ga-amụba nʼọtụtụ puku nʼọnụọgụgụ,
ha ga-adị iri puku kwụrụ puku nʼubi anyị; 14igwe ehi anyị ga-adọkpụ ibu dị arọ.
A gaghị enwe ntipu na mgbidi anyị niile,
a gaghị adọta anyị nʼagha gaa obodo ọzọ,
akwa ihe mgbu agaghị adị nʼokporoụzọ anyị niile. 15Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị ihe ndị a dịịrị;
ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha.
144:3 Abụ 8:4
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.