Abụ Ọma 143
Psalms 143 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m,
gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka amara;
nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị na ezi omume gị,
bịa nyere m aka. 2Edubatala m nʼọnọdụ ikpe m ikpe,
nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla dị ndụ bụ onye ezi omume nʼihu gị.* 3Onye iro na-achụ m ọsọ,
ọ na-azọpịa ndụ m nʼala;
na-emekwa ka m nọdụ nʼọchịchịrị,
dịka ndị nwụrụ anwụ nʼogologo oge gara aga. 4Ya mere mmụọ m na-ada mba nʼime m
ụjọ jupụtakwara m nʼobi. 5Ana m echeta ụbọchị niile ndị ahụ gara aga;
ana m atụgharị uche nʼọrụ gị niile
na-echekwa echiche banyere ihe niile aka gị rụrụ. 6Ana m agbasa aka m abụọ nye gị;
agụụ gị na-agụ mkpụrụobi m dịka agụụ mmiri ozuzo si agụ ala kpọrọ nkụ. Sela 7O Onyenwe anyị, zaa m ọsịịsọ;
mmụọ m na-ada mba.
Ezonarịla m ihu gị,
ma ọ bụghị ya, aga m adị ka ndị na-arịda ruo nʼili. 8Mee ka m nụrụ okwu ịhụnanya gị nke na-adịghị agharịpụ nʼisi ụtụtụ,
nʼihi na ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi.
Zi m ụzọ m kwesiri ịgbaso,
nʼihi na ọ bụ gị ka m na-eweli mkpụrụobi m nye. 9O Onyenwe anyị, gbapụta m site nʼaka ndị iro m,
nʼihi na ọ bụ nʼime gị ka m na-ezo onwe m. 10Kuziere m ime uche gị,
nʼihi na ị bụ Chineke m;
ka ezi Mmụọ gị
duo m nʼala dị larịị. 11O Onyenwe anyị, nʼihi aha gị chebe ndụ m;
nʼime ezi omume gị, napụta m site na nsogbu. 12Nʼime ịhụnanya gị na-adịghị agharịpụ, kpochapụ ndị iro m;
laa ndị niile kpọrọ m asị nʼiyi,
nʼihi na abụ m ohu gị.
143:2 Job 4:17; 9:2; Ekl 7:20
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.