Native Bible

Psalms 143 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 143
1O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m, gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka amara; nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị na ezi omume gị, bịa nyere m aka. 2Edubatala m nʼọnọdụ ikpe m ikpe, nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla dị ndụ bụ onye ezi omume nʼihu gị.* 3Onye iro na-achụ m ọsọ, ọ na-azọpịa ndụ m nʼala; na-emekwa ka m nọdụ nʼọchịchịrị, dịka ndị nwụrụ anwụ nʼogologo oge gara aga. 4Ya mere mmụọ m na-ada mba nʼime m ụjọ jupụtakwara m nʼobi. 5Ana m echeta ụbọchị niile ndị ahụ gara aga; ana m atụgharị uche nʼọrụ gị niile na-echekwa echiche banyere ihe niile aka gị rụrụ. 6Ana m agbasa aka m abụọ nye gị; agụụ gị na-agụ mkpụrụobi m dịka agụụ mmiri ozuzo si agụ ala kpọrọ nkụ. Sela 7O Onyenwe anyị, zaa m ọsịịsọ; mmụọ m na-ada mba. Ezonarịla m ihu gị, ma ọ bụghị ya, aga m adị ka ndị na-arịda ruo nʼili. 8Mee ka m nụrụ okwu ịhụnanya gị nke na-adịghị agharịpụ nʼisi ụtụtụ, nʼihi na ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi. Zi m ụzọ m kwesiri ịgbaso, nʼihi na ọ bụ gị ka m na-eweli mkpụrụobi m nye. 9O Onyenwe anyị, gbapụta m site nʼaka ndị iro m, nʼihi na ọ bụ nʼime gị ka m na-ezo onwe m. 10Kuziere m ime uche gị, nʼihi na ị bụ Chineke m; ka ezi Mmụọ gị duo m nʼala dị larịị. 11O Onyenwe anyị, nʼihi aha gị chebe ndụ m; nʼime ezi omume gị, napụta m site na nsogbu. 12Nʼime ịhụnanya gị na-adịghị agharịpụ, kpochapụ ndị iro m; laa ndị niile kpọrọ m asị nʼiyi, nʼihi na abụ m ohu gị. 143:2 Job 4:17; 9:2; Ekl 7:20

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.