Native Bible

Psalms 143:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Kuziere m ime uche gị, nʼihi na ị bụ Chineke m; ka ezi Mmụọ gị duo m nʼala dị larịị.

Psalms 143:10 in English

Psalms 143:10 · Berean Standard Bible

Teach me to do Your will, for You are my God. May Your good Spirit lead me on level ground.

Context

8Mee ka m nụrụ okwu ịhụnanya gị nke na-adịghị agharịpụ nʼisi ụtụtụ, nʼihi na ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi. Zi m ụzọ m kwesiri ịgbaso, nʼihi na ọ bụ gị ka m na-eweli mkpụrụobi m nye. 9O Onyenwe anyị, gbapụta m site nʼaka ndị iro m, nʼihi na ọ bụ nʼime gị ka m na-ezo onwe m. 10Kuziere m ime uche gị, nʼihi na ị bụ Chineke m; ka ezi Mmụọ gị duo m nʼala dị larịị. 11O Onyenwe anyị, nʼihi aha gị chebe ndụ m; nʼime ezi omume gị, napụta m site na nsogbu. 12Nʼime ịhụnanya gị na-adịghị agharịpụ, kpochapụ ndị iro m; laa ndị niile kpọrọ m asị nʼiyi, nʼihi na abụ m ohu gị. 143:2 Job 4:17; 9:2; Ekl 7:20

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.