Abụ Ọma 144:3
Psalms 144:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Onyenwe anyị, gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche echiche banyere ya,* gịnị ka nwa nke mmadụ bụ ihe banyere ya ji na-emetụ gị nʼobi?
Psalms 144:3 in English
Psalms 144:3 · Berean Standard Bible
O LORD, what is man, that You regard him, the son of man that You think of him?
Context
1Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye bụ oke nkume m,
onye na-ezi aka m abụọ ibu agha,
na mkpịsịaka m ịlụ ọgụ. 2Ọ bụ Chineke m, onye jupụtara nʼịhụnanya, bụrụkwa ebe mgbaba m e wusiri ike,
ebe m e wusiri ike na onye mgbapụta m,
ọ bụ ọta m, onye m na-agbaba nʼime ya,
onye ji aka ike mee ka ndị dị iche iche nọdụ nʼokpuru m. 3O Onyenwe anyị, gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche echiche banyere ya,*
gịnị ka nwa nke mmadụ bụ ihe banyere ya ji na-emetụ gị nʼobi? 4Mmadụ dị ka otu nkuume;
ụbọchị ndụ ya niile na-agafe ngwangwa dịka onyinyo. 5O Onyenwe anyị, kewaa eluigwe rịdata;
metụ ugwu niile aka ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.