Native Bible

Psalms 140:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị niile gbara m gburugburu na-ebuli isi ha elu na nganga ka ndụ ọjọọ nke egbugbere ọnụ ha rikpuo ha.

Psalms 140:9 in English

Psalms 140:9 · Berean Standard Bible

May the heads of those who surround me be covered in the trouble their lips have caused.

Context

7Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị Onye nzọpụta m dị ike, ị na-ekpuchi isi m nʼụbọchị agha. 8Ekwekwala ka ndị ajọ omume chọta ihe ha na-achọ, o Onyenwe anyị, ekwekwala ka nzube ha mezuo. Sela 9Ndị niile gbara m gburugburu na-ebuli isi ha elu na nganga ka ndụ ọjọọ nke egbugbere ọnụ ha rikpuo ha. 10Ka icheku ọkụ na-ere ere dakwasị ha; ka a tụba ha nʼime ọkụ na-ere ere, nʼime olulu apịtị jupụtara, nke ha na-enweghị ike isite nʼime ya pụta ọzọ. 11Ekwela ka ndị na-ekwu okwu nkwulu guzosie ike nʼala, ka ihe ọjọọ chụda ndị na-eme ihe ike.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.