Native Bible

Psalms 140:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka icheku ọkụ na-ere ere dakwasị ha; ka a tụba ha nʼime ọkụ na-ere ere, nʼime olulu apịtị jupụtara, nke ha na-enweghị ike isite nʼime ya pụta ọzọ.

Psalms 140:10 in English

Psalms 140:10 · Berean Standard Bible

May burning coals fall on them; may they be thrown into the fire, into the miry pits, never to rise again.

Context

8Ekwekwala ka ndị ajọ omume chọta ihe ha na-achọ, o Onyenwe anyị, ekwekwala ka nzube ha mezuo. Sela 9Ndị niile gbara m gburugburu na-ebuli isi ha elu na nganga ka ndụ ọjọọ nke egbugbere ọnụ ha rikpuo ha. 10Ka icheku ọkụ na-ere ere dakwasị ha; ka a tụba ha nʼime ọkụ na-ere ere, nʼime olulu apịtị jupụtara, nke ha na-enweghị ike isite nʼime ya pụta ọzọ. 11Ekwela ka ndị na-ekwu okwu nkwulu guzosie ike nʼala, ka ihe ọjọọ chụda ndị na-eme ihe ike. 12Amaara m na Onyenwe anyị ga-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ogbenye na-emekwa ka ndị nọ na mkpa nweta ihe ruuru ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.