Abụ Ọma 140:11
Psalms 140:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ekwela ka ndị na-ekwu okwu nkwulu guzosie ike nʼala, ka ihe ọjọọ chụda ndị na-eme ihe ike.
Psalms 140:11 in English
Psalms 140:11 · Berean Standard Bible
May no slanderer be established in the land; may calamity hunt down the man of violence.
Context
9Ndị niile gbara m gburugburu na-ebuli isi ha elu na nganga
ka ndụ ọjọọ nke egbugbere ọnụ ha rikpuo ha. 10Ka icheku ọkụ na-ere ere dakwasị ha;
ka a tụba ha nʼime ọkụ na-ere ere,
nʼime olulu apịtị jupụtara, nke ha na-enweghị ike isite nʼime ya pụta ọzọ. 11Ekwela ka ndị na-ekwu okwu nkwulu guzosie ike nʼala,
ka ihe ọjọọ chụda ndị na-eme ihe ike. 12Amaara m na Onyenwe anyị ga-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ogbenye
na-emekwa ka ndị nọ na mkpa nweta ihe ruuru ha. 13Nʼezie, ndị ezi omume ga-eto aha gị,
ndị ziri ezi ga-ebikwa nʼihu gị.
140:3 Rom 3:13; Jem 3:8
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.