Native Bible

Psalms 138 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 138
1O Onyenwe anyị, aga m eji obi m niile too gị; nʼihu chi niile dị iche iche ka m ga-abụku gị abụ otuto. 2Aga m akpọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị aga m etokwa aha gị nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼihi na i meela ka aha gị na okwu gị dị elu karịa ihe niile.* 3Mgbe m kpọkuru gị, ị zara m; i mere m ka m nwee nkwuwa okwu ma guzosiekwa ike. 4O Onyenwe anyị, ka ndị eze niile nọ nʼụwa too gị, mgbe ha nụrụ ihe niile i nyere nʼiwu. 5Ka ha bụọ abụ banyere ụzọ niile nke Onyenwe anyị, nʼihi na ebube Onyenwe anyị dị ukwuu. 6Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ na-elekwasị ndị dị umeala nʼobi anya, ma ọ naghị ekwe ka ndị nganga bịa ya nso. 7A sịkwarị na m na-eje ije nʼetiti nsogbu, ị na-echebe ndụ m; ị na-esetipụ aka gị megide iwe ndị kpọrọ m asị, ị na-eji aka nri gị zọpụta m.* 8Onyenwe anyị ga-emezuru m ihe niile o kwadoro m;* ịhụnanya gị, o Onyenwe anyị, na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ahapụkwala ọrụ aka gị niile. 138:2 Aịz 42:21 138:7 Abụ 23:3-4 138:8 Fil 1:6

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.