Abụ Ọma 138:6
Psalms 138:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ na-elekwasị ndị dị umeala nʼobi anya, ma ọ naghị ekwe ka ndị nganga bịa ya nso.
Psalms 138:6 in English
Psalms 138:6 · Berean Standard Bible
Though the LORD is on high, He attends to the lowly; but the proud He knows from afar.
Context
4O Onyenwe anyị, ka ndị eze niile nọ nʼụwa too gị,
mgbe ha nụrụ ihe niile i nyere nʼiwu. 5Ka ha bụọ abụ banyere ụzọ niile nke Onyenwe anyị,
nʼihi na ebube Onyenwe anyị dị ukwuu. 6Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ na-elekwasị ndị dị umeala nʼobi anya,
ma ọ naghị ekwe ka ndị nganga bịa ya nso. 7A sịkwarị na m na-eje ije nʼetiti nsogbu,
ị na-echebe ndụ m;
ị na-esetipụ aka gị megide iwe ndị kpọrọ m asị,
ị na-eji aka nri gị zọpụta m.* 8Onyenwe anyị ga-emezuru m ihe niile o kwadoro m;*
ịhụnanya gị, o Onyenwe anyị, na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
ahapụkwala ọrụ aka gị niile.
138:2 Aịz 42:21
138:7 Abụ 23:3-4
138:8 Fil 1:6
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.