Native Bible

Psalms 138:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A sịkwarị na m na-eje ije nʼetiti nsogbu, ị na-echebe ndụ m; ị na-esetipụ aka gị megide iwe ndị kpọrọ m asị, ị na-eji aka nri gị zọpụta m.*

Psalms 138:7 in English

Psalms 138:7 · Berean Standard Bible

If I walk in the midst of trouble, You preserve me from the anger of my foes; You extend Your hand, and Your right hand saves me.

Context

5Ka ha bụọ abụ banyere ụzọ niile nke Onyenwe anyị, nʼihi na ebube Onyenwe anyị dị ukwuu. 6Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ na-elekwasị ndị dị umeala nʼobi anya, ma ọ naghị ekwe ka ndị nganga bịa ya nso. 7A sịkwarị na m na-eje ije nʼetiti nsogbu, ị na-echebe ndụ m; ị na-esetipụ aka gị megide iwe ndị kpọrọ m asị, ị na-eji aka nri gị zọpụta m.* 8Onyenwe anyị ga-emezuru m ihe niile o kwadoro m;* ịhụnanya gị, o Onyenwe anyị, na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ahapụkwala ọrụ aka gị niile. 138:2 Aịz 42:21 138:7 Abụ 23:3-4 138:8 Fil 1:6

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.