Native Bible

Psalms 138:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe m kpọkuru gị, ị zara m; i mere m ka m nwee nkwuwa okwu ma guzosiekwa ike.

Psalms 138:3 in English

Psalms 138:3 · Berean Standard Bible

On the day I called, You answered me; You emboldened me and strengthened my soul.*

Context

1O Onyenwe anyị, aga m eji obi m niile too gị; nʼihu chi niile dị iche iche ka m ga-abụku gị abụ otuto. 2Aga m akpọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị aga m etokwa aha gị nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼihi na i meela ka aha gị na okwu gị dị elu karịa ihe niile.* 3Mgbe m kpọkuru gị, ị zara m; i mere m ka m nwee nkwuwa okwu ma guzosiekwa ike. 4O Onyenwe anyị, ka ndị eze niile nọ nʼụwa too gị, mgbe ha nụrụ ihe niile i nyere nʼiwu. 5Ka ha bụọ abụ banyere ụzọ niile nke Onyenwe anyị, nʼihi na ebube Onyenwe anyị dị ukwuu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.