Native Bible

Psalms 106:41 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ raara ha nye nʼaka ndị mba ọzọ dị iche iche, ndị kpọrọ ha asị chịkwara ha.

Psalms 106:41 in English

Psalms 106:41 · Berean Standard Bible

He delivered them into the hand of the nations, and those who hated them ruled over them.

Context

39Ha sitere nʼihe ha na-eme merụọ onwe ha; site nʼaka ọrụ ha, maka uru ha nyefere onwe ha nʼaka ndị na-emerụ ha. 40Nʼihi nke a, iwe were Onyenwe anyị megide ndị ya; ọ gụkwara ihe nketa ya dịka ihe rụrụ arụ. 41Ọ raara ha nye nʼaka ndị mba ọzọ dị iche iche, ndị kpọrọ ha asị chịkwara ha. 42Ndị iro ha mekpara ha ahụ chie ha ọnụ nʼala nʼokpuru ike ha. 43Ọtụtụ oge, ọ napụtara ha, ma ha nọgidesịrị ike nʼinupu isi site na ndụmọdụ ya, bụrụ ndị lara nʼiyi nʼime mmehie ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.