Native Bible

Psalms 106:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha sitere nʼihe ha na-eme merụọ onwe ha; site nʼaka ọrụ ha, maka uru ha nyefere onwe ha nʼaka ndị na-emerụ ha.

Psalms 106:39 in English

Psalms 106:39 · Berean Standard Bible

They defiled themselves by their actions and prostituted themselves by their deeds.

Context

37Ha gara nʼihu were ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom chụọrọ chi na-abụghị chi aja.* 38Ha na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọbụla, ọbara ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom, bụ ndị ha chụrụ dịka aja nye arụsị niile nke ala Kenan, si otu a jiri ọbara ha merụọ ala ahụ. 39Ha sitere nʼihe ha na-eme merụọ onwe ha; site nʼaka ọrụ ha, maka uru ha nyefere onwe ha nʼaka ndị na-emerụ ha. 40Nʼihi nke a, iwe were Onyenwe anyị megide ndị ya; ọ gụkwara ihe nketa ya dịka ihe rụrụ arụ. 41Ọ raara ha nye nʼaka ndị mba ọzọ dị iche iche, ndị kpọrọ ha asị chịkwara ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.