Native Bible

Proverbs 4:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị, ị gaghị asụkwa ngọngọ mgbe ị na-agba ọsọ.

Proverbs 4:12 in English

Proverbs 4:12 · Berean Standard Bible

When you walk, your steps will not be impeded; when you run, you will not stumble.

Context

10Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị; ị ga-enwekwa ndụ ogologo. 11M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe, duokwa gị nʼụzọ ziri ezi. 12Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị, ị gaghị asụkwa ngọngọ mgbe ị na-agba ọsọ. 13Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha, nʼihi na ọ ga-eduba gị na ndụ zuruoke. 14Emela dịka ndị na-emebi iwu. Esokwala ụzọ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.