Native Bible

Proverbs 4:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị; ị ga-enwekwa ndụ ogologo.

Proverbs 4:10 in English

Proverbs 4:10 · Berean Standard Bible

Listen, my son, and receive my words, and the years of your life will be many.

Context

8Ọ bụrụ na i bulie amamihe elu, o ga-ebulikwa gị elu. Jidesie ya ike, ọ ga-ewetara gị oke nsọpụrụ. 9Ọ ga-eji okpueze okoko osisi chọọ isi gị mma nyekwa gị okpueze mara mma nʼisi gị.” 10Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị; ị ga-enwekwa ndụ ogologo. 11M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe, duokwa gị nʼụzọ ziri ezi. 12Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị, ị gaghị asụkwa ngọngọ mgbe ị na-agba ọsọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.