Ilu 4:11
Proverbs 4:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe, duokwa gị nʼụzọ ziri ezi.
Proverbs 4:11 in English
Proverbs 4:11 · Berean Standard Bible
I will guide you in the way of wisdom; I will lead you on straight paths.
Context
9Ọ ga-eji okpueze okoko osisi chọọ isi gị mma
nyekwa gị okpueze mara mma nʼisi gị.” 10Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị;
ị ga-enwekwa ndụ ogologo. 11M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe,
duokwa gị nʼụzọ ziri ezi. 12Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị,
ị gaghị asụkwa ngọngọ mgbe ị na-agba ọsọ. 13Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha,
nʼihi na ọ ga-eduba gị na ndụ zuruoke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.