Native Bible

Proverbs 4:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emela dịka ndị na-emebi iwu. Esokwala ụzọ ha.

Proverbs 4:14 in English

Proverbs 4:14 · Berean Standard Bible

Do not set foot on the path of the wicked or walk in the way of evildoers.

Context

12Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị, ị gaghị asụkwa ngọngọ mgbe ị na-agba ọsọ. 13Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha, nʼihi na ọ ga-eduba gị na ndụ zuruoke. 14Emela dịka ndị na-emebi iwu. Esokwala ụzọ ha. 15Zeere ha, ejekwala nʼụzọ ha; chepu ihu gị nʼụzọ ahụ, 16nʼihi na ndị na-emebi iwu adịghị arahụ ụra tutu ha emee arụ nke ụbọchị ahụ. Ha anaghị ezu ike tutu ha emee ka otu onye maa nʼọnya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.