Ilu 30:10
Proverbs 30:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ekwujọla ohu nʼihu nna ya ukwu, ka ọ ghara ịbụ gị ọnụ, ikpe amaa gị.
Proverbs 30:10 in English
Proverbs 30:10 · Berean Standard Bible
Do not slander a servant to his master, or he will curse you, and you will bear the guilt.
Context
8Nke mbụ, mee ka okwu efu na okwu ụgha dị anya nʼebe m nọ.
Nke abụọ, e nyela m ọnọdụ ogbenye maọbụ ọnọdụ ọgaranya,
kama nye m naanị nri ga-ezuru m kwa ụbọchị niile. 9Nʼihi na, ọ bụrụ na m aghọọ ọgaranya, ma eleghị anya, afọ ga-eju m, jubiga m oke,
ruo na m ga-asị na m achọkwaghị gị ma kwuokwa si, ‘Onye ka Onyenwe anyị bụ?’
Ọ bụrụkwa na m adaa ogbenye, ma eleghị anya, aga m ezu ohi,
site nʼụzọ dị otu a, wetara aha nsọ gị Chineke, ihe ihere. 10“Ekwujọla ohu nʼihu nna ya ukwu,
ka ọ ghara ịbụ gị ọnụ, ikpe amaa gị. 11“Ọ dị ndị* na-akọcha nna ha,
ha adịghị agọzikwa nne ha; 12Ọgbọ ndị dị ọcha nʼanya nke onwe ha
ma asapụbeghị isisi nʼunyi ha ruru.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.