Native Bible

Proverbs 30:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na, ọ bụrụ na m aghọọ ọgaranya, ma eleghị anya, afọ ga-eju m, jubiga m oke, ruo na m ga-asị na m achọkwaghị gị ma kwuokwa si, ‘Onye ka Onyenwe anyị bụ?’ Ọ bụrụkwa na m adaa ogbenye, ma eleghị anya, aga m ezu ohi, site nʼụzọ dị otu a, wetara aha nsọ gị Chineke, ihe ihere.

Proverbs 30:9 in English

Proverbs 30:9 · Berean Standard Bible

Otherwise, I may have too much and deny You, saying, ‘Who is the LORD?’ Or I may become poor and steal, profaning the name of my God.

Context

7“O Onyenwe anyị, naanị ihe abụọ ka m na-arịọ gị tupu m nwụọ; ajụkwala imere m ha: 8Nke mbụ, mee ka okwu efu na okwu ụgha dị anya nʼebe m nọ. Nke abụọ, e nyela m ọnọdụ ogbenye maọbụ ọnọdụ ọgaranya, kama nye m naanị nri ga-ezuru m kwa ụbọchị niile. 9Nʼihi na, ọ bụrụ na m aghọọ ọgaranya, ma eleghị anya, afọ ga-eju m, jubiga m oke, ruo na m ga-asị na m achọkwaghị gị ma kwuokwa si, ‘Onye ka Onyenwe anyị bụ?’ Ọ bụrụkwa na m adaa ogbenye, ma eleghị anya, aga m ezu ohi, site nʼụzọ dị otu a, wetara aha nsọ gị Chineke, ihe ihere. 10“Ekwujọla ohu nʼihu nna ya ukwu, ka ọ ghara ịbụ gị ọnụ, ikpe amaa gị. 11“Ọ dị ndị* na-akọcha nna ha, ha adịghị agọzikwa nne ha;

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.