Ilu 30:7
Proverbs 30:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“O Onyenwe anyị, naanị ihe abụọ ka m na-arịọ gị tupu m nwụọ; ajụkwala imere m ha:
Proverbs 30:7 in English
Proverbs 30:7 · Berean Standard Bible
Two things I ask of You— do not refuse me before I die:
Context
5“Okwu ọnụ Chineke niile bụ ihe anụchara anụcha,
Ọ bụ ọta nye ndị na-agbaba nʼime ya izere ndụ. 6Atụkwasịla ihe ọbụla nʼokwu ya,
ka ọ ghara ịbara gị mba, ka ị gharakwa ịghọ onye ụgha. 7“O Onyenwe anyị, naanị ihe abụọ ka m na-arịọ gị tupu m nwụọ;
ajụkwala imere m ha: 8Nke mbụ, mee ka okwu efu na okwu ụgha dị anya nʼebe m nọ.
Nke abụọ, e nyela m ọnọdụ ogbenye maọbụ ọnọdụ ọgaranya,
kama nye m naanị nri ga-ezuru m kwa ụbọchị niile. 9Nʼihi na, ọ bụrụ na m aghọọ ọgaranya, ma eleghị anya, afọ ga-eju m, jubiga m oke,
ruo na m ga-asị na m achọkwaghị gị ma kwuokwa si, ‘Onye ka Onyenwe anyị bụ?’
Ọ bụrụkwa na m adaa ogbenye, ma eleghị anya, aga m ezu ohi,
site nʼụzọ dị otu a, wetara aha nsọ gị Chineke, ihe ihere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.