Ilu 30:6
Proverbs 30:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Atụkwasịla ihe ọbụla nʼokwu ya, ka ọ ghara ịbara gị mba, ka ị gharakwa ịghọ onye ụgha.
Proverbs 30:6 in English
Proverbs 30:6 · Berean Standard Bible
Do not add to His words, lest He rebuke you and prove you a liar.
Context
4Olee onye na-arịgo nʼeluigwe na-arịdatakwa?
Onye ka ọ bụ, bụ onye jikọtara ifufe nʼaka ya?
Onye kwa weere akwa kechikọtaa osimiri niile nʼaka ya?
Onye hiwere oke nsọtụ ụwa niile? Onye ka ọ bụ?
Ọ bụrụ na ị ma onye ọ bụ, gịnị bụ aha ya?
Gịnịkwa bụ aha nwa ya? 5“Okwu ọnụ Chineke niile bụ ihe anụchara anụcha,
Ọ bụ ọta nye ndị na-agbaba nʼime ya izere ndụ. 6Atụkwasịla ihe ọbụla nʼokwu ya,
ka ọ ghara ịbara gị mba, ka ị gharakwa ịghọ onye ụgha. 7“O Onyenwe anyị, naanị ihe abụọ ka m na-arịọ gị tupu m nwụọ;
ajụkwala imere m ha: 8Nke mbụ, mee ka okwu efu na okwu ụgha dị anya nʼebe m nọ.
Nke abụọ, e nyela m ọnọdụ ogbenye maọbụ ọnọdụ ọgaranya,
kama nye m naanị nri ga-ezuru m kwa ụbọchị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.