Native Bible

Proverbs 30:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ọ dị ndị* na-akọcha nna ha, ha adịghị agọzikwa nne ha;

Proverbs 30:11 in English

Proverbs 30:11 · Berean Standard Bible

There is a generation of those who curse their fathers and do not bless their mothers.

Context

9Nʼihi na, ọ bụrụ na m aghọọ ọgaranya, ma eleghị anya, afọ ga-eju m, jubiga m oke, ruo na m ga-asị na m achọkwaghị gị ma kwuokwa si, ‘Onye ka Onyenwe anyị bụ?’ Ọ bụrụkwa na m adaa ogbenye, ma eleghị anya, aga m ezu ohi, site nʼụzọ dị otu a, wetara aha nsọ gị Chineke, ihe ihere. 10“Ekwujọla ohu nʼihu nna ya ukwu, ka ọ ghara ịbụ gị ọnụ, ikpe amaa gị. 11“Ọ dị ndị* na-akọcha nna ha, ha adịghị agọzikwa nne ha; 12Ọgbọ ndị dị ọcha nʼanya nke onwe ha ma asapụbeghị isisi nʼunyi ha ruru. 13Ọ dị ndị anya ha dị nʼelu, ndị ile anya ha jupụtara na nlelị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.