Native Bible

Proverbs 30:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọgbọ ndị dị ọcha nʼanya nke onwe ha ma asapụbeghị isisi nʼunyi ha ruru.

Proverbs 30:12 in English

Proverbs 30:12 · Berean Standard Bible

There is a generation of those who are pure in their own eyes and yet unwashed of their filth.

Context

10“Ekwujọla ohu nʼihu nna ya ukwu, ka ọ ghara ịbụ gị ọnụ, ikpe amaa gị. 11“Ọ dị ndị* na-akọcha nna ha, ha adịghị agọzikwa nne ha; 12Ọgbọ ndị dị ọcha nʼanya nke onwe ha ma asapụbeghị isisi nʼunyi ha ruru. 13Ọ dị ndị anya ha dị nʼelu, ndị ile anya ha jupụtara na nlelị. 14Ndị eze ha niile bụ mma agha ịkịrị eze ha bụkwa mma maka irichapụ ndị ogbenye site nʼụwa na ndị nọ nʼụkọ site nʼetiti mmadụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.