Ilu 30:12
Proverbs 30:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọgbọ ndị dị ọcha nʼanya nke onwe ha ma asapụbeghị isisi nʼunyi ha ruru.
Proverbs 30:12 in English
Proverbs 30:12 · Berean Standard Bible
There is a generation of those who are pure in their own eyes and yet unwashed of their filth.
Context
10“Ekwujọla ohu nʼihu nna ya ukwu,
ka ọ ghara ịbụ gị ọnụ, ikpe amaa gị. 11“Ọ dị ndị* na-akọcha nna ha,
ha adịghị agọzikwa nne ha; 12Ọgbọ ndị dị ọcha nʼanya nke onwe ha
ma asapụbeghị isisi nʼunyi ha ruru. 13Ọ dị ndị anya ha dị nʼelu,
ndị ile anya ha jupụtara na nlelị. 14Ndị eze ha niile bụ mma agha
ịkịrị eze ha bụkwa mma
maka irichapụ ndị ogbenye site nʼụwa
na ndị nọ nʼụkọ site nʼetiti mmadụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.