Ilu 24:26
Proverbs 24:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọsịsa ziri ezi bụ ihe na-egosi ikwesi ntụkwasị obi.*
Proverbs 24:26 in English
Proverbs 24:26 · Berean Standard Bible
An honest answer given is like a kiss on the lips.
Context
24Onye ọbụla nke na-asị onye ikpe mara, “Onye ezi omume ka ị bụ,”*
ga-anata ọbụbụ ọnụ site nʼọnụ ọtụtụ mmadụ, mba niile ga-eweso ya iwe. 25Ma ọ ga-adịrị ndị ahụ na-abara onye ikpe mara mba na mma,
ha ga-anatakwa ezi ngọzị. 26Ọsịsa ziri ezi
bụ ihe na-egosi ikwesi ntụkwasị obi.* 27Rụchaa ọrụ gị dị nʼezi.
Dozie ala ubi gị.
Emesịa wuoro onwe gị ụlọ. 28Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị nʼefu.
Ọ bụ egbugbere ọnụ gị abụọ ka ị ga-eji ghọọ aghụghọ?*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.