Native Bible

Proverbs 24:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye ọbụla nke na-asị onye ikpe mara, “Onye ezi omume ka ị bụ,”* ga-anata ọbụbụ ọnụ site nʼọnụ ọtụtụ mmadụ, mba niile ga-eweso ya iwe.

Proverbs 24:24 in English

Proverbs 24:24 · Berean Standard Bible

Whoever tells the guilty, “You are innocent”— peoples will curse him, and nations will denounce him;

Context

22Nʼihi na ọ bụ na mberede ka ị ga-eso ha daba na nhụju anya. Onye maara ihe ga-abụ ọgwụgwụ ya? 23Ndị a bụkwa okwu ọzọ ndị amamihe kwuru, iji gosi na ikpe ikpe na-akwụghị ọtọ adịghị mma. 24Onye ọbụla nke na-asị onye ikpe mara, “Onye ezi omume ka ị bụ,”* ga-anata ọbụbụ ọnụ site nʼọnụ ọtụtụ mmadụ, mba niile ga-eweso ya iwe. 25Ma ọ ga-adịrị ndị ahụ na-abara onye ikpe mara mba na mma, ha ga-anatakwa ezi ngọzị. 26Ọsịsa ziri ezi bụ ihe na-egosi ikwesi ntụkwasị obi.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.