Native Bible

Proverbs 17:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ naanị iru ụjụ na obi ọjọọ dịịrị nna nke nwa ya na-eme ihe nzuzu.

Proverbs 17:21 in English

Proverbs 17:21 · Berean Standard Bible

A man fathers a fool to his own grief; the father of a fool has no joy.

Context

19Onye na-ahụ esemokwu nʼanya hụrụ mmehie nʼanya. Onye na-ewuli ọnụ ụzọ ama ya elu na-akpọ ntipịa oku. 20Ọ dịghị aga nʼihu bụ onye obi ya gbagọrọ agbagọ. Onye nwere ire nrafu ga-adanye na nsogbu. 21Ọ bụ naanị iru ụjụ na obi ọjọọ dịịrị nna nke nwa ya na-eme ihe nzuzu. 22Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike, ma mmụọ na-eru ụjụ oge niile na-akpata ọrịa. 23Onye ajọ omume na-anara ihe ngarị* na nzuzo ka ọ sụgharịa ikpe ziri ezi isi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.