Ilu 17:23
Proverbs 17:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ajọ omume na-anara ihe ngarị* na nzuzo ka ọ sụgharịa ikpe ziri ezi isi.
Proverbs 17:23 in English
Proverbs 17:23 · Berean Standard Bible
A wicked man takes a covert bribe * to subvert the course of justice.
Context
21Ọ bụ naanị iru ụjụ na obi ọjọọ
dịịrị nna nke nwa ya na-eme ihe nzuzu. 22Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike,
ma mmụọ na-eru ụjụ oge niile na-akpata ọrịa. 23Onye ajọ omume na-anara ihe ngarị* na nzuzo
ka ọ sụgharịa ikpe ziri ezi isi. 24Onye nwere nghọta na-eche uche amamihe nʼihe ọ na-eme,
ma anya onye nzuzu na-elegharị ruo na nsọtụ nke ụwa. 25Nwa dị nzuzu na-ewetara nna ya mwute,
bụrụkwa nne mụrụ ya ihe ilu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.