Ilu 17:24
Proverbs 17:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye nwere nghọta na-eche uche amamihe nʼihe ọ na-eme, ma anya onye nzuzu na-elegharị ruo na nsọtụ nke ụwa.
Proverbs 17:24 in English
Proverbs 17:24 · Berean Standard Bible
Wisdom is the focus of the discerning, but the eyes of a fool wander to the ends of the earth.
Context
22Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ sie ike,
ma mmụọ na-eru ụjụ oge niile na-akpata ọrịa. 23Onye ajọ omume na-anara ihe ngarị* na nzuzo
ka ọ sụgharịa ikpe ziri ezi isi. 24Onye nwere nghọta na-eche uche amamihe nʼihe ọ na-eme,
ma anya onye nzuzu na-elegharị ruo na nsọtụ nke ụwa. 25Nwa dị nzuzu na-ewetara nna ya mwute,
bụrụkwa nne mụrụ ya ihe ilu. 26Ọ bụrụ na ịra onye ezi omume nra adịghị mma,
nʼezie, ịpịa ndị ọrụ ihe nʼihi ezi ọrụ ha ezighị ezi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.