Ilu 17:19
Proverbs 17:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-ahụ esemokwu nʼanya hụrụ mmehie nʼanya. Onye na-ewuli ọnụ ụzọ ama ya elu na-akpọ ntipịa oku.
Proverbs 17:19 in English
Proverbs 17:19 · Berean Standard Bible
He who loves transgression loves strife; he who builds his gate high invites destruction.
Context
17Ezi enyi na-egosi ịhụnanya ya nʼoge ọbụla.
Otu a kwa, nwanne na-aba uru nʼoge mkpa. 18Ọ bụ uche ezughị oke ịnara ụgwọ onye ọzọ ji,
si otu a ghọọ onye ji ụgwọ. 19Onye na-ahụ esemokwu nʼanya hụrụ mmehie nʼanya.
Onye na-ewuli ọnụ ụzọ ama ya elu na-akpọ ntipịa oku. 20Ọ dịghị aga nʼihu bụ onye obi ya gbagọrọ agbagọ.
Onye nwere ire nrafu ga-adanye na nsogbu. 21Ọ bụ naanị iru ụjụ na obi ọjọọ
dịịrị nna nke nwa ya na-eme ihe nzuzu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.