Ilu 17:18
Proverbs 17:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ uche ezughị oke ịnara ụgwọ onye ọzọ ji, si otu a ghọọ onye ji ụgwọ.
Proverbs 17:18 in English
Proverbs 17:18 · Berean Standard Bible
A man lacking judgment strikes hands in pledge and puts up security for his neighbor.
Context
16Uru gịnị ka ego bara nʼaka onye nzuzu;
ebe ọ bụ na o nweghị ike ịchọ amamihe. 17Ezi enyi na-egosi ịhụnanya ya nʼoge ọbụla.
Otu a kwa, nwanne na-aba uru nʼoge mkpa. 18Ọ bụ uche ezughị oke ịnara ụgwọ onye ọzọ ji,
si otu a ghọọ onye ji ụgwọ. 19Onye na-ahụ esemokwu nʼanya hụrụ mmehie nʼanya.
Onye na-ewuli ọnụ ụzọ ama ya elu na-akpọ ntipịa oku. 20Ọ dịghị aga nʼihu bụ onye obi ya gbagọrọ agbagọ.
Onye nwere ire nrafu ga-adanye na nsogbu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.