Ilu 17:13
Proverbs 17:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na i jiri ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọma, ọbụbụ ọnụ dịrị ezinaụlọ gị.
Proverbs 17:13 in English
Proverbs 17:13 · Berean Standard Bible
If anyone returns evil for good, evil will never leave his house.
Context
11Onye ọjọọ na-ebi naanị ndụ nnupu isi* megide Chineke.
Ọ bụkwa onyeozi nke ọnwụ* ka a ga-eziga imegide ya. 12Ọ ka mma izute nne Bịa a napụrụ ụmụ ya
karịa izute onye nzuzu uche ya gbagọrọ agbagọ. 13Ọ bụrụ na i jiri ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọma,
ọbụbụ ọnụ dịrị ezinaụlọ gị. 14Esemokwu malite ọ na-esi ike imedo ya,
nʼihi ya ekwela ka ọ malite. 15Onye na-asị onye ikpe maara na ikpe amaghị ya na-amakwa onye aka ya dị ọcha ikpe,
Onyenwe anyị na-akpọ omume abụọ a asị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.