Ilu 17:15
Proverbs 17:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-asị onye ikpe maara na ikpe amaghị ya na-amakwa onye aka ya dị ọcha ikpe, Onyenwe anyị na-akpọ omume abụọ a asị.
Proverbs 17:15 in English
Proverbs 17:15 · Berean Standard Bible
Acquitting the guilty and condemning the righteous— both are detestable to the LORD.
Context
13Ọ bụrụ na i jiri ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọma,
ọbụbụ ọnụ dịrị ezinaụlọ gị. 14Esemokwu malite ọ na-esi ike imedo ya,
nʼihi ya ekwela ka ọ malite. 15Onye na-asị onye ikpe maara na ikpe amaghị ya na-amakwa onye aka ya dị ọcha ikpe,
Onyenwe anyị na-akpọ omume abụọ a asị. 16Uru gịnị ka ego bara nʼaka onye nzuzu;
ebe ọ bụ na o nweghị ike ịchọ amamihe. 17Ezi enyi na-egosi ịhụnanya ya nʼoge ọbụla.
Otu a kwa, nwanne na-aba uru nʼoge mkpa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.