Native Bible

Proverbs 17:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ ka mma izute nne Bịa a napụrụ ụmụ ya karịa izute onye nzuzu uche ya gbagọrọ agbagọ.

Proverbs 17:12 in English

Proverbs 17:12 · Berean Standard Bible

It is better to meet a bear robbed of her cubs than a fool in his folly.

Context

10Ịba mba ntakịrị a baara onye nwere nghọta bara uru karịa narị ụtarị nke a pịara onye nzuzu. 11Onye ọjọọ na-ebi naanị ndụ nnupu isi* megide Chineke. Ọ bụkwa onyeozi nke ọnwụ* ka a ga-eziga imegide ya. 12Ọ ka mma izute nne Bịa a napụrụ ụmụ ya karịa izute onye nzuzu uche ya gbagọrọ agbagọ. 13Ọ bụrụ na i jiri ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọma, ọbụbụ ọnụ dịrị ezinaụlọ gị. 14Esemokwu malite ọ na-esi ike imedo ya, nʼihi ya ekwela ka ọ malite.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.