Native Bible

Proverbs 17:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ịba mba ntakịrị a baara onye nwere nghọta bara uru karịa narị ụtarị nke a pịara onye nzuzu.

Proverbs 17:10 in English

Proverbs 17:10 · Berean Standard Bible

A rebuke cuts into a man of discernment deeper than a hundred lashes cut into a fool.

Context

8Nʼanya onye na-enye ngarị ọ na-ahụta ya dịka ọgwụ ịrata mmadụ, ha na-eche nʼebe ọbụla ha chere ihu ihe ga-aga nke ọma. 9Onye ọbụla na-akwado ịhụnanya na-ekpuchi njehie, ma onye na-ekwu ihe mere mgbe na mgbe na-ekewa ezi enyi. 10Ịba mba ntakịrị a baara onye nwere nghọta bara uru karịa narị ụtarị nke a pịara onye nzuzu. 11Onye ọjọọ na-ebi naanị ndụ nnupu isi* megide Chineke. Ọ bụkwa onyeozi nke ọnwụ* ka a ga-eziga imegide ya. 12Ọ ka mma izute nne Bịa a napụrụ ụmụ ya karịa izute onye nzuzu uche ya gbagọrọ agbagọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.