Ọbadaya 1:11
Obadiah 1:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ahụ, ị nọọrọ onwe gị, na-ele ndị ọbịa ka ha na-akwakọrọcha akụnụba ya, sitekwa nʼọnụ ụzọ ama ya gafee fee nza iji kerie Jerusalem. Ị dịkwa ka otu onye nʼime ha.
Obadiah 1:11 in English
Obadiah 1:11 · Berean Standard Bible
On the day you stood aloof while strangers carried off his wealth and foreigners entered his gate and cast lots for Jerusalem, you were just like one of them.
Context
9Ndị gị bụ dike nʼagha, o Teman, ka ụjọ ga-eri.
Onye ọbụlakwa nọ nʼugwu Ịsọ niile,
ka a ga-egbuda nʼagha. 10Nʼihi na i gbuola ma mesokwa nwanne gị bụ Jekọb ihe ike.
Ihere ga-ekpuchi gị;
a ga-alakwa gị nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi. 11Nʼụbọchị ahụ, ị nọọrọ onwe gị,
na-ele ndị ọbịa ka ha na-akwakọrọcha akụnụba ya,
sitekwa nʼọnụ ụzọ ama ya gafee
fee nza iji kerie Jerusalem.
Ị dịkwa ka otu onye nʼime ha. 12Ma ị garaghị eleda nwanne gị anya
nʼụbọchị nsogbu ya,
ị garaghị aṅụ ndị Juda
nʼụbọchị ahụ e bibiri ha.
Ị garaghị anyara ha isi
nʼụbọchị ahụ ha nọ na nsogbu. 13I kwesighị isite nʼọnụ ụzọ ama ndị m zọọ ije
nʼụbọchị ha nọ na nsogbu,
o zighị ezi na i ga-enwe obi aṅụrị nʼoge ihe ọjọọ bịakwasịrị ha,
nʼụbọchị ha nọ na nsogbu,
maọbụ jiri aka ike pụnara ha akụ ha
nʼụbọchị nsogbu ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.